Psalms 53:1-3
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid.
Nzuzu nke ndị na-emebi iwu
1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
2Chineke sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya,
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,
onye nke na-achọ Chineke.
3Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,
ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
Copyright information for
IboBIU